Thursday, April 24, 2025 - 13:24

Omumu na Omenala Ezi na Uno ndi Igbo

Biko Agozina.   “Omumu na Omenala Ezi na Uno ndi Igbo.”  Igbo Studies Review (ISR) , Goldline & Jacobs Publishing , no. 8, 2020 , pp. 169-179 .
0 0 10

Abstract

Cha-cha-cha ndi Igbo Kwenu! Kwenu! Muo nu! Zuzuo nu! Ndi Igbo turu ilu we si o, na ihe amuru amu ka ihe agwolu agwo. Ya mere omumu jilu bulu ihe di mkpa na omenala ndi Igbo maka na nwa mkpi si na njepuga di mma ya jili jee ibe nne ya welu muta isolu onu elu. Umu akwukwo na eje akwukwo jee muta ihe di iche iche. Ma na tufu ha ebido jewe akwukwo, ha ga egbegodu igbe, jee ije, muta asusu Igbo nke di na ire nne ha. Omumu na ada ka imu nwa, imalu dakwaa ka ima mma. Onye mutalu ihe ofulu di ka onye mutalu nwa ofulu. Ikwu amaghi, ibe ezi ya bu okwu ndi Igbo ji egosi na adighi amacha ife uwa amacha maka na a na aju ajuju si, ebe I ma nke a, I ma nke ozo? Nwanne m asikwana na gi amalusigo bu ndumodu Osita Osadebe dulu anyi. Ndi ogbalu ofulu ufodu achoghizi imuta ihe ofulu, ufodou na ime ha bu soso ego oku ka ha cholu, a si ha bia muo olu aka ha asi mba, a si ha bia kowa ugbo ha asi gi akplikwana ha, a si ka a zuwa ha na akwukwo ha ajuo gi ma ndi nke guchalu ha agutalu ya gini? Ya melu obi uto jili di m na a si m bia kwuo okwu gbasalu ihe omumu na omenala ezi na uno ndi Igbo maka na ndi omumu na ato uto ebuka na ala Igbo. Na ime okwu m a, aga m eji soso asusu Igbo welu kwuputa ya, onye si na ya anaghi anu Igbo, ya mara na uzu amaghi akpu ogene ga ene anya na odu egbe. Ma I na anu Igbo ma I naghi anu Igbo, Igbo ga anu gi bu okwu Ojukwu gwara ada ndi Igbo amuru na obodo America. Atuolu omalu, omalu; a tuolu ofeke, o mee gini? O fejie olu.

 

Author(s): Biko Agozina

About the author(s)

 

Published: May 21, 2020

Journal: Igbo Studies Review (ISR)

Issue: 8

Pages: 169-179

Publisher: Goldline & Jacobs Publishing

Social Interactions

Please log in to like or comment.

Comments (0)

No comments yet. Be the first to comment!