Ọsọndụ Agwụ Ike: Ntule Abọnaabọ dịka O siri metụta Asụsụ na Omenala Igbo
Conference: The 23rd Annual International Conference of the Igbo Studies Association (ISA) (2026)
Presenter(s): Chiamaka Ngozi Oyeka, Chigozie Bright Nnabuihe
Presentation Date: February 23, 2026 @ 14:24 PM
Tags: Nigeria University of Lagos Lagos
Abstract
Ndị Igbo kwenyere na ụwa na-aga naàbọ̀ naàbọ̀, na ọ na-abụ ihe kwụru, ihe akwudebe ya. Ihe ọbụla nwere ihu nwekwara azụ. Nchọpụta e nwere n’oge ugbua na-egosi na ọtụtụ ndị ntorobịa na-elodozi anya n’otu ụzọ gbasara ebimndụ, karichaa, ụzọ nke ha ga-aka si na ya rite nnukwu uru, ma chefuo na ihe ụwa na-aga ụzọ abụọ. Ọrụ nchọcha a ga-elebanye anya na mkpụrụokwu na usorookwu ndị Igbo na-aga naàbọ̀ naàbọ̀ iji chọpụta ụdị ha, ndokọ ha, mpụtara ha na ihe ndị Igbo ji ha akụzi maka ebimndụ. Ndị omenchọcha a nwetere njiede ha site n’ajụjụọnụ ha gbara ma ndị ntorobịa ma ndị okenye, tinyekwuoro ihe ndị ha mabu dịka ndị Igbo. Nchọpụta e nwetere na-egosi na abọnaabọ na-apụta ihe ma na mkpụrụokwu ma n’usorookwu; a na-eji njikọ ejikọ mkpụrụokwu na ahịrịokwu ndị a n’otu n’otu iji gosipụta nke ya na ibe ya na-agakọ. Ụfọdu n’ime okwu ndị a na-egosipụta ihe ndị ha na ibe ha na-agakọta, ọnodu mọọbụ ndịiche dị n’etiti ihe ụfọdụ. E wezuga ihe e ji ụdị mkpụrụokwu ndị a akụzi, e jikwa ha achọ ekwumekwu mọọbụ edemede mma. Ndetu mkpụrụokwu na usorookwu ndị a ga-enye aka ichekwa ha ma nyekwa aka n’ịkụziri ndị ntorobịa nkwenye ndị Igbo na ihe ụwa na-aga naàbọ̀ naàbọ̀.
15 views