Ebe Mmepụta Ọrụ Nka dị iche iche: Ohere dị Mkpa n’Ala Igbo
Conference: ISA 22nd Annual International Conference (2025)
Presenter(s): Ifeyinwa Cordelia Isidienu
Tags: 2025 Nnamdi Azikiwe University Awka Ifeyinwa Cordelia Isidienu
Abstract
Ndị Igbo bụ agbụrụ na-arụsi ọrụ ike. Ha na-akatọ ịda ngana n’ihi ya, onye Igbo ọbụla na-enwe ọrụ nka o ji mere akaọrụ. Mmadụ ji ọrụ nka enyere onwe ya aka, na-azụ ezinaụlọ ya, na inyere obodo aka. Iji igwe, osisi na aja ụrọ rụpụta ihe, ịhazi nri maka nchekwa, ikwe akwa, bụcha ihe ndị Igbo na-eme iji nyere ndụ aka. Ọrụ nka ndị a nwere ụzọ dị iche iche e si emepụta ha, ma bụrụ ezi ohere e si enweta akaọrụ. Ugbu a, ihe agbanweela n’ihi nleghara anya a na-eleghara ọrụ nka nke mere ka ọ na-adaghachi azụ. Nchọcha a bụ iji kpọlitekwa ebe mmepụta ọrụ nka ndị a, kpọghachite uche ndị mmadụ azụ ka enweghị aka ọrụ nke so n’otu ihe cheere ọdịniihu obodo aka mgba wee belata. E ji ajụjụ ọnụ na nleruanya wee chịkọta ihe e ji mee nchọcha a. A chọpụtara n’ihe so ebute ndaghachi azụ ọrụ nka ndị Igbo bụ na ụfọdụ ndị Igbo anaghịzị enwe mmasị n’ọrụ nka ha, tinyere enwetaghị nkwado n’ebe ndị gọọmentị nọ. Nchọcha a ga-eme ka ewulite omenala Igbo, nke hibereisi n’ọrụ nka ha. Nke a ga-abụ ohere ọma nye ndị Igbo n’iji wulite ọdịmma ndị mmadụ; ma ọ bụrụkwa na e chekwaa ọrụ nka ndị a.
23 views