Your cart is empty

    ISA NEWSLETTER, VOL. 2, NO. 1, WINTER 2015

    Igbo Studies Association Newsletter, Vol 2, No 1, Winter 2015March 23, 2015

    Ndi ISA,

    Ekele dịrị ụnụ. Ọ bụrụ mụ onwe m nnukwute ihe obi añụrị iweputere ụnụ agba nke abụọ nke akwụkwọ mgbasa ozi ndị Igbo Studies Association (ISA).

    N’afọ 2014, anyị hiwere usoro ibipute akwụkwọ mgbasa ozi nke anyị kpọrọ ISA Newsletter na bekee. E bum n’obi ya bụ inye ndị ISA ọtụtụ uzọ dị iche iche ga-eme ka ọha n’eze mata ntọala, atụmatụ, na nnyocha ha na-eme na mahadum, yana ebe ndị ọzọ dị iche iche ha na-alụ ọlụ. Ekele m na-agara mmadụ niile gbara mbọ maka ịhụ n’anyị wetere ụnụ agba nke mbụ nke akwụkwọ mgbasa ozi a, n’ọnwa Nọvemba afọ 2014.

    Obi dị m ụtọ ibiputere ụnụ agba nke izizi ISA Newsletter nke afọ 2015. N’abga nke mbụ a, ụnụ na-enwete ụdịrị ozi dị iche iche. Anyị wetere ụnụ ozi maka akwụkwọ dị iche iche ndị otu anyị biputere ọhụrụ. Ụnụ ga-agụ edemede maka atụmatụ, yana ihe nnyocha dị iche iche ndị otu anyị na-eme n’ebe dị iche iche. E nwere ihe E.C. Ejiogu dere maka otu ọchịchị Mohammadu Buhari siri megbu ndị Igbo. Jonathan Chimakonam dere maka ochịchị n’ala Igbo. Kelechi Isiodu na-akọwa mkpa ọ dị ịna-ebipute akwụkwọ m’ọ bụ ịna-edegharị akwụkwọ n’asụsụ Igbo. Victor Williamson dere maka nyocha ọ naeme banyere iji Igbo na Yoruba ede ihe n’ama saịba.

    Igbo Studies Association Newsletter, Vol 2, No 1, Winter 2015

    March 23, 2015

    Ndi ISA,

    DOWNLOAD NEWSLETTER

    Ugbu a, ndị Igbo, lee nu agba nke mbụ nke ISA Newsletter nke afọ 2015. Gụọ nụ ya! Kesaa nụ ya! Kọọ nụ akụkọ maka ya! Tụlee nu, tụgharịa nụ uche, kwuo nu ihe ụnụ matara/ chere/ chọpụtara gbasara edemede ndị akwụkwọ mgbasa ozi a na-ewetere ụnụ!

    Ya dịkwara ndị Igbo mma! Ndeewo nu!

    Chidi N. Igwe, PhD
    PRO, Igbo Studies Association.

    MEMBERSHIP DUES

    Your ISA membership must be renewed annually in order to remain active.

    • Regular Member (Renewal) - $50
    • Student Member (Renewal) - $30
    • Regular Member (New) - $75
    • Student Member (New) - $55
    • Life Member - $1000

    CONFERENCE FEES

    • Regular Member - $100
    • Regular Africa – $70
    • Student Member - $50
    • Life Member - $100
    • Non-Member - $120

    CONTACT ISA

    The Director,
    Igbo Studies Association Secretariat & Center for Igbo Studies
    Fine Arts Building, Room # 321
    Dominican University
    7900 W. Division Street
    River Forest, IL 60305 USA
    Telephone: (708) 488-5302